Skip Navigation

DVD Ilustrado Multilíngue

The Biology of Prenatal Development




BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


 

Baixar Versão em PDF  O Que é PDF?
 

Capítulo 40   3 a 4 Meses (12 a 16 Semanas): Papilas Gustativas, Movimento de Mandíbula, Reflexo de Sucção, Percepção dos Primeiros Movimentos do Feto

N’etiti izu iri na otu na izu iri na abụọ, arụ fitọs na-abawaye ruo ihe dị ka pasenti iri isii.

Izu iri na-abụọ n’egosi ngwucha ụzọ nke mbụ n’ime atọ, ma ọ bụ ụzọ atọ nke ekere n’ oge afọime.

Ihe nd eji anụ ụtọ ndị pụruụ iche biaziri ugbu a jupute n’ime ọnụ.
N’ oge ọmụmụ nwa, ihe ndi na-eme ka nwa nụọ ụtọ ka ga-anọkwa ya naani n’ire na n’okpo ọnụ.

Njaghari afọ na-amalite n’oge dị ka izu iri na abụọ ma gakwaa n’ihu ruo ihe dika izu isii.

Ihe mbụ nwa amụrụ ohụrụ n’anyụputa ka ana-akpọ mekoniọmụ. Emebere ya site n’ụmụ irighiri ihe na-agwa nri, ihe ndi na-edozi ahụ, nakwa sel ndị nwụrụ anwụ nke ihe na-agwa nri wụsasịrị.

N’izu iri na abụọ, ogologo aka a chọla iru etu otosịrị iru n’ogo nke ahụ mmadụ. ( ya bụ ogo ahụ nwa ahụ) Ụkwụ na-ewe ogologo oge n’igaru ogo etu otosịrị iru.

Ewezụga azụ na elu isi, ahụ nwa ebu n’afọ niile na-emegharị na mmetụta aka dị mfe.

Ndiiche na-adị na otito na-esite ma mmadụ abụ nwoke ma ọbụ nwanyị na aputa ihie mgbe nke izizi. Iji maa atụ, ụmụaka ebu n’afọ ndị nke nwanyi na-ezikoputa mmegharị nke agba ha ugboro ugboro karia ụmụ nwoke.

Ndiiche dị na mmegharị nke nlubiri ahụrụ na mgbe mbụ, mmetụta aka n’akụkụ ọnụ na-eme ka nwa tugharịa ebe ænye, ma ọbụ ihe, metutara ya aka nọ nakwa megharikwa ọnụ ya. Mmegharia ka ana-akpọ "rutin refleks" ọ na-adigidekwa ma amụchaa nwa, na-enyere nwa amụrụ ọhụrụ aka ịchọta ọnụ ara nne ya n’oge ana-enye ya ara.

Ihu nwa ana-aga n’ihu na-aka aka ka abuba na-amalite ijuputa nti nwa nakwa ka ntolite eze malitekwara.

N’izu iri na ise, sel na-akpụ ọbara abata na-amụba n’ime ụmị ọkpụkpụ. Imilikiti ọkpụkpụ sel na-ebubata ọbara ga-amalite ebe a.

N’agbanyeghi, na embrayo na-amalite immeghari ahụ n’izu isii, nwanyi dị ime na-enwetụta mmeghari ahụ izizi nke nwa ebu n’afọ n’etiti izu iri na anọ na izu iri na asatọ. N’odinaala, ihe dị otu a ka ana-akpọ kwikinin (ya bụ ịnụtụta mmegharị ahụ izizi fitọs).