Skip Navigation

DVD Ilustrado Multilíngue

The Biology of Prenatal Development




BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


 

Baixar Versão em PDF  O Que é PDF?
 

Capítulo 1   Introdução

Mmegharị ụda, usoro nke otu sel nge nke akwa mmadụ chara acha jiri bụrụ sel nari agụtaagụta nke okenye nwere ike ịbụ ịhe kachasi pụta ihie n’ụwa.

Ndị nchọpụta amatala ugbu a na ọtụtụ usoro ọrụ nke ahụ okenye na-arụ na-agba mkpọlọgwụ n’afọime - ọtụtụ mgbe tupu ọmụmụnwa.

Oge usoro otito tupu ọmụmụ nwa ka aghọtara dika ọge nkwadebe bụrụkwa ọge nke mmadụ na-eto eto na- enweta ọtụtụ ndọkọ, na mmụgharị nke ọtụtụ nka achọrọ maka ịdịndu ma amụchaa nwa.

Capítulo 2   Terminologia

Idiime na mmadụ na-anọrukarị rahụrahụ izu iri atọ na asatọ dịka esiri haa ya site n’oge njikọta spam nke nwoke na akwa nke nwanyị, ma ọ bụ site n’ọge ọtụtụime ruo n’ọmụmụ.

N’izu asatọ nke mbụ na-esote njikọta spam nke nwoke na akwa nke nwanyị, mmadụ na amalite otuto izizi n’ụwa ka ana akpọ “ẹmbrayo”, nke pụtara “otito n’ime.” Ọge a ana-akpọ ọge mmalite ọkpụkpụ, bụ oge amara amara eji akpụpụta ọtụtụ akụkụ ahụ ndị kachasi mkpa n’ahụ mmadụ.

Site na ngwụcha izu asatọ ruo na ngwụcha afọime, “mmadụ nke na-akpụta akpụta ka ana-akpọ fitọs,” nke pụtara “nwa na-amụbeghị amụ” (ya bụ nwa ebu n’afọ). N’oge ana-akpọ oge nke fitọs (ya bụ oge ebu nwa n’afọ), anụ ahụ na–eto nke ukwu, akụkụ ahụ dị iche na–ebido rụwa ọrụ.

Ọge ọkpụkpụ na oge fitọs n’ile di n’ime ihe ọmụmụa n’ekwu maka oge kemgbe njikọ spam nwoke na akwa nwanyị.