Skip Navigation

DVD Ilustrado Multilíngue

The Biology of Prenatal Development




BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


 

Baixar Versão em PDF  O Que é PDF?
 

Desenvolvimento Embrionário: 4 a 6 Semanas

Capítulo 11   4 Semanas: Líquido Amniótico

N’ izu anọ amịnịọn doro anya na agba ẹmbrayo gburugburu n’ihe dịka akpa mmiri juru. Mmiri aga a, ana - akpọ akpa mmiri ọmụmụ, na – echedokwa ẹmbrayo maka ihe mmerụ ahụ.

Capítulo 12   O Coração em Ação

Mkpụrụobi na - akuru ihe dịka ugboro otu nari na iri na atọ n’otu nkeji.

Hụba ama ka mkpụrụobi si – agbanwe agwa mgbe obara n’a-abata na-apụkwa n’akpa ya n’otu ụda.

Mkpụrụobi na-akụ nhatanha ugboro nde iri ise na anọ tupu ọmụmụnwa nakwa ihe kariri ugboro njeri atọ na nari puku abụọ n’ije ndụ onye gbara afọ iri asatọ.

Capítulo 13   O Crescimento do Cérebro

Otito ụbụrụ nke dị osọ ọsọ na-apụta ihe site na-mgbawe nke anụahụ nke ụbụrụ dị n’iru, ụbụrụ dị n’etiti, na ụbụrụ nke dị n’azụ.

Capítulo 14   Brotos dos Membros

Otito nke ukwu n’aka yana mpụta nke akwa aka n’ukwu, n’izu nke anọ.

N’oge dị otu a,oghere ihe nke anụahụ aputala, n’ihi na osisi ike ya bụ nke naani otu sel.

Anụ ahụ na esi ike, ọ ga-eme ka oghere ihe a ya lakpuo, nke putara na anyi ga enwe ike ilele naanị ogan ndị nke nọ n’ime ka ha ga esi too site oge ahụ ruo ihe dịka otu ọwa ọzọ.

Capítulo 15   5 Semanas: Hemisférios Cerebrais

N’etiti izu anọ na izu ise, ụbụrụ ga-aga n’ihu n’ito ọsọ ọsọ na ekewa n’uzo ise ahụrụ anya.

Isi nwa na-ewe ihe dika otụ n’ime atọ nke ogo niile nwa nọ n’afọ.

Akụkụ ụbụrụ nke amamihe apụta, ga-ewere nwayọọ bụrụzie akụkụ ụbụrụ nke kachasi ibụ.

Ọrụ niile nke akụkụ ụbụrụ amamihe ga emecha jikota gunyere echiche, mmụta, ncheta, ekwumekwu, ịhụ ụzọ, inụ ihe, mmeghari onwe, na imata ụzọ esi eme ihe.

Capítulo 16   Vias Respiratórias Principais

N’ime sistem okụkụ ume, ngụ akanri na nke akaekpe apụtachala ọ ga-emechakwaa jikọta oghere eji ekunye ume, ma ọbụ opi akpịrị nakwa ngụgụ.

Capítulo 17   Fígado e Rins

Hụba ama umeji di nke ukwu na-eju n’afọ n’akụkụ mkpụrụobi na-eti eti.

Akiri nke na anægide na-aputa n’izu nke ise.

Capítulo 18   Saco Vitelino e Células Germinativas

Ihe na-ekochi ime akwa na-ebu sel æmumu nke mbido nke ana-akpọ sel nke izizi. N’izu ise sel nke izizi ndịa agafele na ọgan ọmụmụnwa nke dị n’akụkụ akịrị.

Capítulo 19   Placas da Mão e Cartilagem

N’izu ise kwa, embrayo enwela ọba aka, Ihe siri ike dịka ịhe na-adọ adọ nke dị na-ahụ mmadụ na-amalite putaba n’izu ise na ọkara.

Ebe a anyi na-ahụ ọba aka ekpe na ngwoaka n’izu ise na mkpụrụ ụbọchị isii.