Skip Navigation

DVD Ilustrado Multilíngue

The Biology of Prenatal Development


6 - 8 Semanas


BAYỌLỌJI NKE MMALITE OTITO TUPU ỌMỤMỤ NWA

.Igbo


 

Baixar Versão em PDF  O Que é PDF?
 

Desenvolvimento Embrionário: 6 a 8 Semanas

Capítulo 20   6 Semanas: Movimento e Sensação

N’izu isii akuku ụbụrụ nke ammamihe na-etolite N’uzọ ahaghị ịha, karịa akụkụ ụbụrụ ndị ọzọ.

Embrayo ahụ ebido ịmmegharị ahụ n’eyighi eyi nakwa ịmmeghari ahụ nke na-emetuta ya. Udị mmeghari ahụ a na-adị mkpa iji kwalite ezigbo otito nke ụmụ irighiri akwara jikọtara ime ahụ.

Imetụ aka n’akụkụ ebe ọnụ dị na-eme ka embrayo sere isi ya ozigbo.

Capítulo 21   A Orelha Externa e a Formação de Célula Sanguínea

Nti nke ana-ahụ anya amalitele iwere ọdịdị ya.

N’izu isii, Ọkpụkpụ sel nke ọbara ebidola ịpụta N’ime umeji ebe limfosaiti ewerela ọnọdụ. Udị sel ọbara ọcha a bụ ihe dị oke mkpa n’otito nke sistem na-egbochi oria dị iche iche.

Capítulo 22   O Diafragma e os Intestinos

Daiafram, bụ ihe mbụ dị mkpa eji eku ume, ka ana akpụtakarị n’izu isii.

Otu akụkụ eriri afọ ga-aputagodi n’ime eriri nwa. usoro a, ana akpọ fisiọlọgikal henieshionụ, na-emeghere ọgan ndi ọzọ na-etoputa n’ime afọ ụzọ.

Capítulo 23   Placas da Mão e Ondas Cerebrais

N’izu isii ọbaaka ebido sawa abadaba.

Ụbụrụ echiche anọdulari kemgbe izu isii na mkpụrụ ụbọchị abụọ.

Capítulo 24   Formação do Mamilo

Ọnuara ebido pụpụtawa n’akụkụ ahụ nwa obere oge tupu ha ruo ebe ha kwesiri ịnọ yaa bụ n’ihu ezeobi.

Capítulo 25   Desenvolvimento dos Membros

N’izu isii na okara ataaka apụtala nke a ga ahụ mara ozigbo, mkpụrụ aka ebidole gbasiwa, ana-ahụkwa mmeghari aka.

Mkpụpụta okpụkụ, nke ana-akpọ osifikeshịọn, ebido n’ime nkọlọ ya, ma ọ bụ ækpụkpụ ukwu olu, nakwa ọkpụkpụ agba elu na nke ala.

Capítulo 26   7 Semanas: Soluços e Resposta a Susto

Ahutakwala echuchuu n’izu asaa.

Aga ahụlikwa mmeghari ụkwụ ugbua, tinyere aziza na-eme n’amaghị ama.

Capítulo 27   O Coração Desenvolvido

Akụkụ anọ nke mkpụrụobi etoputala nke ọma. Dika okwesịrị, mkpụrụobi na-etiru ihe dịka ugboro otu nari na iri isii na asaa n’ime otu nkeji.

Ọdụdọ nke mkpụrụobi na-adi n’izu asaa na ọkara n’egosiputa usoro na-eyite nke okenye.

Capítulo 28   Ovários e Olhos

N’ụmụka ndị nke nwanyị, e nwere ike ihụta akpa akwanwa ha n’izu nke asaa.

N’izu asaa na akara, ọdụ anya aputago ebe ana-ahụ ya, nakwa eluanya amalite oge ito n’ike n’ike.

Capítulo 29   Dedos das Mãos e dos Pés

Mkpụrụ aka agbagasiwala mkpụrụ ukwu na-ejikọta ọnụ naani n’ebe mpụpụta.

Aka nwekwara ike ibiakọta ọnụ ugbu a, otu a ka odikwa ụkwụ.

Ọkpụkpụ ikpere aputakwala.
6 - 8 Semanas