| |
O Período Fetal (8 semanas até o Nascimento)
Capítulo 37 9 Semanas: Engole, Suspira e se Estica
|
| |
| Oge nke fịtọs ga-aga n’ihu
ruo n’oge ọmụmụ nwa.
|
| N’izu itoolu, ịmi aka ebido
nwa ebu n’afọ nwere ike ilo mmiri omụmụ.
|
| nwa ebu n’afọ nwekwara ike ijide ihe aka,
megharia isi ya ka ọ gaa ihu
ma ọ bụ azụ,
mepee ma mechikwaa agba ya,
megharia ire ya, rie ude nakwa gbatia.
Irighiri akwara nọ n’ihu,
nakwa nke nọ n’ọba aka,
na makwa n’oba ụkwụ nwere ike ịmata
mgbe emetụtara aka dị mfe.
"N’imeghari ahụ maka mmetụta dị mfe
n’ọ ọba ụkwụ,"
nwa ebu n’afọ ga-ehulata ukwu ya na ikpere
ya, o nwekwara ike rọkọlata mkpụrụ ụkwụ ya.
|
| Ugbua eluanya emechichala nke ọma.
|
| N’ime ekọ akpịrị,
akwara nke eji ekwu okwu na-aputa
n’egosipụta mmalite ntoputa
nke ebe okwu si apụta.
|
| N’ime ụmụaka ndi nke nwanyi,
a ga amata nke bụ akpanwa ya,
sel ọmụmụ akabeghị aka,
nke ana-akpo ogonia,
na-enwoghari n’ime akpaakwa nwa.
Ihe eji ama nke nwoke na nke nwanyi
ebidole kewaputasiwa onwe ha
dika nke nwoke ma ọ bụkwa nke nwanyị.
|
Capítulo 38 10 Semanas: Revira os olhos e Boceja, Unhas e Impressões Digitais
|
| |
| Otito di egwu ana-enwe n’ime
izu nke itoolu na nke iri
na ebuli arụ nwa n’ihe
kariri pasenti iri asaa na ise.
|
| N’izu nke iri mmetuta nke nkuanya nke elu
n’akpata igwodata anya ala.
nwa ebu n’afọ na-eghe ughere ma na-emepekwa
na-emechi ọnụ ya kwa mgbe kwa mgbe.
|
| Otụtụ ụmụaka ebu n’afọ na-ami
isi aka nri ha.
Akụkụ eriri afọ nọ n’ime eriri nwa
abiaghachiwa n’ime oghere dị n’ime afọ.
|
| Osifikeshionụ [ya bụ mgbe ihe niile eji akpụ ọkpụkpụ
na-abanye n’ebe digasị iche iche na emekwa ka ọkpụkpụ sie ike
|
| Mbọ aka na mbo ụkwụ amalitela tobe.
|
| Akara mkpụrụaka pụrụ iche na-aputa ihie n’izu iri
site na njikọta spam nwoke na akwa nwanyi gasịrị.
Akara a nwere ike ịbụ ihe iruba
ama na ndụ n’ile mmadụ.
|
Capítulo 39 11 Semanas: Absorve Glicose e Água
|
| |
| N’izu iri na otu
imi na egbugbere ọnụ etoputachaala nke ọma.
Dika ọ di n’akụkụ ahụ ndị ọzọ,
ọdịdi ha na-agbanwe n’ogo ọbụla
nke mmadụ toruru na ndụ.
|
| Eririafọ ebido mitawa glukos nakwa mmiri
nke nwa ebu n’afọ loro.
|
| N’agbanyeghi na ana-amata ma
nwa ọ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyi
na njiko spam nke nwoke
na akwa nke nwanyi,
ugbu a ihe nwoke na nwanyi
ji enwe mmekọrita ke dị na mpụta
aputachala nke ọma ugbua
nke bụ na aga-amata ihe dị iche
dị ka ọbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị.
|