| |
Capítulo 40 3 a 4 Meses (12 a 16 Semanas): Papilas Gustativas, Movimento de Mandíbula, Reflexo de Sucção, Percepção dos Primeiros Movimentos do Feto
|
| |
| N’etiti izu iri na otu
na izu iri na abụọ,
arụ fitọs na-abawaye
ruo ihe dị ka pasenti iri isii.
Izu iri na-abụọ n’egosi
ngwucha ụzọ nke mbụ n’ime atọ,
ma ọ bụ ụzọ atọ nke ekere n’ oge afọime.
|
| Ihe nd eji anụ ụtọ ndị pụruụ iche
biaziri ugbu a jupute n’ime ọnụ.
|
| N’ oge ọmụmụ nwa, ihe ndi na-eme ka
nwa nụọ ụtọ ka ga-anọkwa ya
naani n’ire na n’okpo ọnụ.
|
| Njaghari afọ na-amalite n’oge
dị ka izu iri na abụọ
ma gakwaa n’ihu ruo ihe dika izu isii.
Ihe mbụ nwa amụrụ ohụrụ n’anyụputa
ka ana-akpọ mekoniọmụ.
Emebere ya site
n’ụmụ irighiri ihe na-agwa nri,
ihe ndi na-edozi ahụ,
nakwa sel ndị nwụrụ anwụ
nke ihe na-agwa nri wụsasịrị.
|
| N’izu iri na abụọ, ogologo aka
a chọla iru etu otosịrị iru n’ogo nke ahụ mmadụ.
( ya bụ ogo ahụ nwa ahụ)
Ụkwụ na-ewe ogologo oge
n’igaru ogo etu otosịrị iru.
|
| Ewezụga azụ na elu isi,
ahụ nwa ebu n’afọ niile na-emegharị
na mmetụta aka dị mfe.
|
| Ndiiche na-adị na otito na-esite ma mmadụ
abụ nwoke ma ọbụ nwanyị
na aputa ihie mgbe nke izizi.
Iji maa atụ, ụmụaka ebu n’afọ ndị nke nwanyi
na-ezikoputa mmegharị nke agba ha
ugboro ugboro karia ụmụ nwoke.
|
| Ndiiche dị na mmegharị
nke nlubiri ahụrụ na mgbe mbụ,
mmetụta aka n’akụkụ ọnụ na-eme ka
nwa tugharịa ebe ænye, ma ọbụ ihe, metutara
ya aka nọ nakwa megharikwa ọnụ ya.
Mmegharia ka ana-akpọ "rutin refleks"
ọ na-adigidekwa ma amụchaa nwa,
na-enyere nwa amụrụ ọhụrụ
aka ịchọta ọnụ ara nne ya
n’oge ana-enye ya ara.
|
| Ihu nwa ana-aga n’ihu na-aka aka
ka abuba na-amalite ijuputa nti nwa
nakwa ka ntolite eze malitekwara.
|
| N’izu iri na ise,
sel na-akpụ ọbara abata
na-amụba n’ime ụmị ọkpụkpụ.
Imilikiti ọkpụkpụ sel na-ebubata ọbara
ga-amalite ebe a.
|
| N’agbanyeghi, na embrayo na-amalite
immeghari ahụ n’izu isii,
nwanyi dị ime na-enwetụta
mmeghari ahụ izizi nke nwa ebu n’afọ
n’etiti izu iri na anọ
na izu iri na asatọ.
N’odinaala, ihe dị otu a ka ana-akpọ kwikinin
(ya bụ ịnụtụta mmegharị ahụ izizi fitọs).
|