| |
Capítulo 41 4 a 5 Meses (16 a 20 Semanas): Resposta ao Estresse, Verniz Caseoso, Ritmos Circadianos
|
| |
| N’izu iri na isii usoro gunyere nfanye
alanga n’ime afọ nke nwa ebu n’afọ
na-akpalite homonụ
malitere na mmeghari ahụ
na gbapụtakwa nọradrenalini,
ma ọ bụ nọrepinefrini, n’ime ọwa ọbara.
Ụmụaka amụrụ ọhụrụ na ndi okenye
na-enwe mmegharị ahụ yiri onwe ya
n’ihe gbasara usoro ọbula na emekpa ha ahụ.
|
| Na sistem okukuume,
osisi nke ngụ fodụrụ ntakiri ka o zuo oke.
|
| Otu ihe nchekwa dị ọcha,
ana - akpọ “veniks kasiosa”,
ga – ekpuchizi nwa ebu n’afọ ugbua.
Veniks na – echekwa anu ahụ
site n’ihe mgbakasi ahụ
si na mmiri ọmụmụ.
|
| Site n’izu iri na itoolu,
mmeghari ahụ nwa ebu n’afọ,usoro ọkụkụ ume,
na nnọdụ mkpụrụ obi ebido
sowe eregede kwa ụbọchị
nke ana - akpọ sikadian ridims (ya bụ etu eji
emepụta homonụ na-eme ka ihe niile rụọ ọrụ ọfụma).
|
Capítulo 42 6 a 7 Meses (24 a 28 Semanas): Reflexo Cócleo-Palpebral e de Sobressalto; Pupilas Respondem à Luz; Olfato e Paladar
|
| |
| N’izu iri abụọ koklia,
nke bụ ọgan eji anụ ihe,
eruola ogo nke okenye
n’ime otito zuru oke nke
imerime nti.
Site ugbu a gaa n’ihu,
nwa ebu n’afọ ga-emeghari
nyere ọtụtụ ụda dị iche iche.
|
| Ntutu ga-ebido towe n’isi nwa.
Ngidingi na odidi anụ ahụ niile
aputachaala,
tinyere oghere gbara ukwu aji gburu gburu nakwa
akụkụ ahụ mmadụ na-ewere imilikiti ihe n’ime
mmee mmadụ dote ha ma ọbụ wepụ ha n’ahụ mmadụ
|
| N’izu iri abuæ na otu ruo n’izu iri abuæ na abuæ
mgbe njiko spam nwoke na akwa nwanyi ga chara,
ngụ ga-enwetatụ ikikere iji iku ume.
Nke a ka a na-ewe ka mgbe otito nwa nọ n’ime akpa nwa
Ga ezurugor ya nke bụna onwere ike ibilite ndụ
makana ịdị ndu na mputa akpanwa
ga-enwe isi n’ebe ụfọdụ nwa ebu n’afọ nọ.
Ọtụtụ iga n’ihu na nchọpụta
nke ndi na-ahụ maka ahụ ike
na-eme ka enwe ike ichekwa ndụ
nke ụmụaka a mụrụ n’erughi oge ha tosiri iru
tupu amụọ ha (ya bụ ụmụaka akachaghị aka).
|