| |
Capítulo 43 5 a 6 Meses (20 a 24 Semanas): Responde ao Som; Cabelo e Pele; Idade de Viabilidade
|
| |
| N’izu iri abụọ na anọ,
elu anya emepekwa ọzọ
nwa ebu n’afọ na-eziko mmeghari ntabi anya
nke n’eyi gi eyi.
Mmeghari a n’ebe uda ike nọ
na-etoputakari n’oge n’ebe
nwa ebu n’afọ nke nwanyi nọ.
|
| Ọtụtụ ndị nchọputa kowara
na mkpughe n’ebe oke uda nọ
nwere ike imetuta ahuike nke nwa ebu n’afọ.
Nsogbu nwere ike ịpụta
gunyere mgbati ubara nke ọnọdụ mkpụrụobi,
nwa ebu n’afọ ilo ihe karia ka atụrụ anya ya
na mgbawe agwa n’eyi eyi.
Ụfọdụ nsogbu mwere ike idaputa ma emechaa
gunyere na nwa agaghi anụzikwa ihe.
|
| Okuku ume nwa ebu n’afọ nwere ike
ịla elu nke ukwu ihe
dika nkuru ume na nkụpụta ugboro
iri anọ n’anọ dị n’otu nkeji.
|
| N’oge ọnwa atọ nke ikpe azụ n’afọime,
otito osisọ nke ụbụrụ na-eburu
umele ihe kariri pasenti iri ise
nwa ebu n’afọ kuuru.
Arụ uburu na-abawanye ruo ihe
dị ka pasentị narị anọ ma ọ bụ narị ise.
|
| N’izu iri abụọ na isii mkpụrụ
anya ebido gbapụtawa anya mmiri.
Ọdụanya na - emegharị n’oge ebe ihe dị
n’ihe dị ka izu iri abụọ na asaa.
Mmeghari a na – echekota oke ihe
n’erute n’oduanya na ndụ niile onyeahụ.
|
| Ihe niile a chọrọ
iji nụ isi nke ọbụla amalitele rụwa ọrụ.
Ọmụmụ gbasara ụmụaka akachaghị aka
gbara ama ikikere iji chopụta isi
n’oge dị ka izu iri abụọ na isii mgbe njiko
spam nke nwoke na akwa nwanyi gachara.
Idote ihe dị ụtọ n’ime mmiri ọmụmụ
na-ebulite ugboro ole nwa ebu n’afọ
na-elo ihe.
N’idi iche, e nwere mgbada n’usoro
nwa ebu n’afọ si elo ihe
sotere iwebata ihe na-elu ilu.
Mgbanwe ozi dị n’iru
kwa mgbe kwa mgbe na-esotekwa.
|
| Site usoro ntụpụ ụkwụ
yiri agam ije,
nwa ebu n’afọ atugharịwa.
|
| Nwa ebu n’afọ adighịzịkwa ka ọhikọrọ
ahịko etu ọdị mbụ
ka abụba ndị ọzọ na-apụta
n’okpuru anụahụ.
Abụba na arụ orụ di mkpa
n’ikwagide udịdị ahụ
na-edọbakwa umele mgbe amuchara nwa.
|
Capítulo 44 7 a 8 Meses (28 a 32 Semanas): Discriminação de Sons, Estados Comportamentais
|
| |
| N’izu iri abụọ na asaa nwa ebu n’afọ
nwere ike imata ihe dị iche di
n’uda dị elu na nke dị ala.
|
| N’izu iri atọ, a na ahụkarị mmeghari
iku ume ugbua
ọ nakwa eziko site n’oge na pasentị iri ato
ruo iri anọ n’ebe nwa ebu n’afọ nọ.
|
| Mgbe oruru n’onwa anọ nke
ikpeazụ n’afọ ime,
nwa ebu n’afọ na-egosiputa
usoro ọrụ ejikwatara nke ọma
a nwekwa mgbe ezum ike.
Usoro omume ndia
n’egosiputa mbawanye ihe ga-ebute nsogbu
nke sentral nevọs sistem.
|
Capítulo 45 Os Membros e a Pele
|
| |
| Na nhatanha izu iri atọ na abụọ,
ezigbo nkọlọ,
ma ọ bụ sel akpa ume,
amalite itolite na ngụgụ.
Ha ga na-etolite tutu ruo
afọ asatọ amụchara nwa.
|
| N’izu iri atọ na ise nwa ebu n’afọ
amarala ejidesi ihe aka ike.
|
| Mkpughe nwa ebu n’afọ n’ebe
ihe dị iche dị
dika ọ na-emetụtụ ụdị ụtọ nwa
n’achokarị ma amucha ya.
Ima atụ, ụmụaka ebu n’afọ
ndị nne ha riri anaisi,
ihe na-enye likoraịsị ụtọ ya,
gosiri nnabata anaisi mgbe amuchara ha.
Ụmụaka amụrụ ohụrụ ndi eweghi mkpugbe
mgbe ya nọ n’afọ kpọrọ anaisi asị.
|
Capítulo 46 9 Meses até o Nascimento (36 Semanas até o Nascimento)
|
| |
| Nwa ebu n’afọ na-amalite njem ime omume
site n’inuputa homonụ nke
ana-akpọ estrojin nke ukwu
nke a na-amalite ntughari site na nwa ebu
n’afọ buruzie nwa amụrụ ọhụrụ.
Ihe ejiri mara ime omume bụ mbili
elu na mgbadata sirike nke akpanwa,
nke ga-abụzị ọmụmụ nwa.
|
| Site na njikọ spam nwoke na akwa nwanyi ruo
n’ọmụmụ nwa ma ọ bụ karia oge ahụ,
otito mmadụ na-agbanwe agbanwe na-agakwa
n’ihu ma dikwa mgbagwojuanya.
Ihe nchọpụta ohụụ gbasara usoro a
togburu onwe ya.
gosiri mmetụta dị mkpa na
n’otito nwa ebu n’afọ
na ahụike nke ndụ.
Dika nghota anyi n’ihe gbasara mmalite
otito mmadụ na abawanye,
otu a ka ikikere anyi ikwalite
ahụike na-abawanyekwa
ma mgbe adị ime ma mgbe amụrụ nwa.
|