| |
Desenvolvimento Embrionário: 4 a 6 Semanas
Capítulo 11 4 Semanas: Líquido Amniótico
|
| |
| N’ izu anọ
amịnịọn doro anya na agba
ẹmbrayo gburugburu
n’ihe dịka akpa mmiri juru.
Mmiri aga a,
ana - akpọ akpa mmiri ọmụmụ,
na – echedokwa ẹmbrayo maka ihe
mmerụ ahụ.
|
Capítulo 12 O Coração em Ação
|
| |
| Mkpụrụobi na - akuru ihe dịka ugboro
otu nari na iri na atọ n’otu nkeji.
Hụba ama ka mkpụrụobi si – agbanwe agwa
mgbe obara n’a-abata na-apụkwa
n’akpa ya n’otu ụda.
Mkpụrụobi na-akụ nhatanha
ugboro nde iri ise na anọ tupu ọmụmụnwa
nakwa ihe kariri ugboro njeri
atọ na nari puku abụọ
n’ije ndụ onye gbara afọ iri asatọ.
|
Capítulo 13 O Crescimento do Cérebro
|
| |
| Otito ụbụrụ nke dị osọ ọsọ na-apụta ihe
site na-mgbawe nke anụahụ
nke ụbụrụ dị n’iru,
ụbụrụ dị n’etiti,
na ụbụrụ nke dị n’azụ.
|
Capítulo 14 Brotos dos Membros
|
| |
| Otito nke ukwu n’aka
yana mpụta nke akwa aka n’ukwu,
n’izu nke anọ.
|
| N’oge dị otu a,oghere ihe nke
anụahụ aputala,
n’ihi na osisi ike ya bụ
nke naani otu sel.
Anụ ahụ na esi ike,
ọ ga-eme ka oghere ihe a ya lakpuo,
nke putara na anyi ga enwe ike ilele naanị
ogan ndị nke nọ n’ime
ka ha ga esi too site oge ahụ
ruo ihe dịka otu ọwa ọzọ.
|
Capítulo 15 5 Semanas: Hemisférios Cerebrais
|
| |
| N’etiti izu anọ na izu ise,
ụbụrụ ga-aga n’ihu n’ito ọsọ ọsọ
na ekewa n’uzo ise ahụrụ anya.
Isi nwa na-ewe ihe dika otụ n’ime atọ
nke ogo niile nwa nọ n’afọ.
Akụkụ ụbụrụ nke amamihe apụta,
ga-ewere nwayọọ bụrụzie akụkụ
ụbụrụ nke kachasi ibụ.
Ọrụ niile nke akụkụ ụbụrụ amamihe
ga emecha jikota
gunyere echiche, mmụta,
ncheta, ekwumekwu, ịhụ ụzọ,
inụ ihe, mmeghari onwe,
na imata ụzọ esi eme ihe.
|
Capítulo 16 Vias Respiratórias Principais
|
| |
| N’ime sistem okụkụ ume,
ngụ akanri na nke akaekpe apụtachala
ọ ga-emechakwaa jikọta
oghere eji ekunye ume, ma ọbụ opi akpịrị
nakwa ngụgụ.
|
Capítulo 17 Fígado e Rins
|
| |
| Hụba ama umeji di nke ukwu
na-eju n’afọ
n’akụkụ mkpụrụobi na-eti eti.
Akiri nke na anægide na-aputa
n’izu nke ise.
|
Capítulo 18 Saco Vitelino e Células Germinativas
|
| |
| Ihe na-ekochi ime akwa na-ebu sel æmumu
nke mbido
nke ana-akpọ sel nke izizi.
N’izu ise
sel nke izizi ndịa agafele
na ọgan ọmụmụnwa
nke dị n’akụkụ akịrị.
|
Capítulo 19 Placas da Mão e Cartilagem
|
| |
| N’izu ise kwa,
embrayo enwela ọba aka,
Ihe siri ike dịka ịhe na-adọ adọ nke dị na-ahụ
mmadụ na-amalite putaba n’izu ise na ọkara.
Ebe a anyi na-ahụ ọba aka ekpe
na ngwoaka n’izu ise na
mkpụrụ ụbọchị isii.
|